1 Kings 2:3 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, bú Chineke-gi, ije n'uzọ-Ya nile, idebe ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-ya nile, na ihe-àmà-Ya nile, dika ihe edere n'iwu Moses si di, ka i we nwe uche n'ihe ọ bula nke i nēme, na n'ebe ọ bula i nēche iru-gi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị.