1 Kings 2:32 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya.