1 Kings 20:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n'ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n'usoro. Ha we do onwe-ha n'usoro imegide obodo ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha.