1 Kings 20:29 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi Israel na ncherita-iru ndi Siria, ubọchi asa. O rue, n'ubọchi nke-asa, na agha biaruru nso; umu Israel we tib͕ue Siria, orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje, n'otù ubọchi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ụbọchị asaa ka ha mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ibe ha. Ma nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị agha malitere ibu agha. Ndị Izrel merụrụ narị puku ndị agha Aram ahụ nʼotu ụbọchị.