1 Kings 20:39 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, mb͕e eze nāgabiga, na onye ahu tikuru eze nkpu: ọ si, Orù-gi puru ba n'etiti agha; ma, le, otù nwoke wezugara onwe-ya, me ka otù nwoke biakutem, ọ si, Debe nwoke a: ọ buru na ele anya ya ma-ọli ma ahughi ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ma-ọbu na i gākwu talent ọla-ọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe eze na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe m, biko gee m ntị. Lee, otu onye agha bịakwutere m mgbe m nọ nʼihu agha sị m, ‘Lee nwoke a a dọtara nʼagha; chee ya nche. Ekwekwala ka ọ gbanarị gị. Nʼihi na ọ bụrụ na o site nʼaka gị gbapụ, ị ga-anwụ, maọbụ i jiri otu talenti ọlaọcha gbara isi gị.’