1 Kings 20:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ma m'gēzitere gi ndi-orùm dika mb͕e a echi, ha gāchọ kwa n'ulo-gi, na ulo ndi-orù-gi;ọ gēru kwa, na ihe ọ bula anya-gi nāchọsi ike, ha gētiye ya n'aka-ha, were ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’ ”