1 Kings 20:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O we si ndi-ozi Ben-hedad, Sinu onye-nwem, bú eze, Ihe nile i buru uzọ zitere orù-gi ozi ime, nke ahu ka m'gēme: ma ihe a, apughm ime ya. Ndi-ozi we la, weghachiri ya okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’ ” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru.