1 Kings 22:38 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ewe ṅachapu ub͕ọ-ala-ya n'akuku ọdọ-miri Sameria; nkita we racha ọbara-ya; (ma ndinyom nākwa iko sara aru-ha n'ebe ahu;) dika okwu Jehova si di nke O kwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha sachara ụgbọ agha ya nʼọdọ mmiri dị na Sameria (ebe ndị akwụna na-asa ahụ). Ụmụ nkịta rachara ọbara ya, dịka okwu Onyenwe anyị kwubiri.