1 Kings 22:43 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O jere ije n'uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihe niile o jere ije nʼụzọ Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ niile.