1 Kings 5:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi-orùm gēsi na Lebanon buputa ha oké osimiri: mu onwem gāb͕a kwa ha ka ha se n'elu oké osimiri rue ebe ahu nke i gēziterem ozi, m'gātọsa kwa ha n'ebe ahu, gi onwe-gi gēburu kwa ha: gi onwe-gi gēme kwa ihe nātọm utọ, n'inye ulom nri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”