1 Kings 6:20 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma n'iru ime-ime-ulo ahu di orú cubit n'ogologo, na orú cubit n'obosara, na orú cubit n'idi-elu-ya; ọ machita ya ọla-edo makarisiri nma: o were kwa osisi cedar machita ebe-ichu-àjà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ime ime ebe nsọ ahụ, dị mita iri nʼogologo, obosara ya dịkwa mita iri, ịdị elu ya dịkwa mita iri. O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọ a niile, jiri osisi sida machie ebe nchụaja ya.