1 Kings 6:8 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku nke-etiti di n'akuku aka-nri nke ulo ahu: ha we si n'uzọ-nrigo nke nāga buruburu nārigo n'ulo ntà nke-etiti, si kwa na nke-etiti je rue nke-atọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ.