1 Kings 7:3 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ewere osisi cedar kpuchie ya n'elu, n'elu ọgu ulo ntà nke akuku abua na ise, nke di n'elu ogidi; iri na ise n'otù akuku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụkwa osisi sida ka e ji machie elu ụlọ ahụ. A kụkwasịrị osisi ndị a nʼelu osisi sida ukwu ndị a a wara awa, ndị e mere ka ha nọkwasị nʼogidi ndị ahụ. Ọnụọgụgụ osisi ndị ahụ bụ iri anọ na ise. Ọ bụkwa iri na ise ka e nwere nʼahịrị ọbụla.