1 Kings 7:30 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ihe-ndọkwasi ọ bula nwere wheel ọla anọ, na axle ọla: ukwu-ya anọ nwere ubu: n'okpuru ite ọsisa-miri ahu ka ubu ahu akpuru akpu di, n'akuku ihe aturu atu ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ihe ndọkwasị ọbụla nwere ụkwụ bronz anọ dị gburugburu, nweekwa okporo bronz ebe ụkwụ ndị a na-agbagharị. Nʼakụkụ anọ nke ihe ndọkwasị ndị a, a rụnyere ebe a na-adọkwasị efere. E ji oyiyi okoko osisi na ahịhịa chọọ ihe ndị a mma.