1 Kings 7:33 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Otú emere wheel nile di ka esi eme wheel ub͕ọ-ala: aka nile ha, na azu nile ha, na ihe nile nējikọta ha, na etiti nile ha, awuru ha nile awu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E mekwara ụkwụ ndị a dịka ụkwụ ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ. Ọ bụkwa ọla ka e ji kpụọ akụkụ ihe ndọkwasị ahụ niile, ma okporo igwe ukwu, ma okporo igwe nta, na ihe niile jikọtara ha.