1 Kings 7:45 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ite niile, shọvel niile na efere ịkwọsa mmiri. Ihe ndị a niile nke Huram meere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz na-egbu maramara ka eji mee ha.