1 Kings 8:50 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Gi b͕aghara kwa ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi, na njehie-ha nile nke ha jehieworo megide Gi; Gi nye kwa ha ka enwe obi-ebere n'aru ha n'iru ndi nādọta ha n'agha, ka ha we nwe obi-ebere n'aru ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere.