1 Kings 9:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ub͕ò atọ n'arọ ka Solomon surere àjà-nsure-ọku na àjà-udo nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà nke o wuru, o we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ tiyere ya n'elu ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova. O we wuzue ulo ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugboro atọ nʼafọ, ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.