1 Peter 1:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha gbalịsịrị ike ịchọpụta ihe Mmụọ Kraịst ahụ bi nꞌime ha na-ekwu, mgbe ọ na-agwa ha okwu. Nꞌihi na okwu ahụ nile Mmụọ Kraịst gwara ha bụ ihe mezuru na ndụ Kraịst. O mezuru nꞌahụhụ ya nile na ebube nile ga-eso ahụhụ a. Ma nꞌoge ahụ ha aghọtaghị mgbe ihe ahụ ha na-ebu amụma banyere Kraịst ga-emezu. Ha amakwaghị nꞌoge ahụ onye ọ ga-emezu nꞌahụ ya.
Igbo 2006
nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya.