1 Peter 1:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na okwu Chineke gwara anyị sị, Ndụ mmadụ nile na-agabiga dị ka ahihia nke na-emesi kpọnwụọ, daa. Ịma mma nile nke mmadụ na ebube ya dịkwa ka okoko osisi nke na-ama mma, ma emesịa, ọ daa nꞌala laa nꞌiyi.
Igbo 2006
N'ihi na, Anu-aru nile di ka ahihia, Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia. Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,