1 Peter 1:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka otuto na nsọpụrụ nile dịrị Chineke, Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌobi ebere ya nke o nwere nꞌebe anyị nọ ka o ji nye anyị ndụ ọhụrụ ahụ mere ka a kpọbata anyị nꞌezinụlọ ya. Ugbu a anyị nwere olileanya iketa ndụ ebighị ebi nꞌihi na Kraịst esitela nꞌọnwụ bilie.
Igbo 2006
Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst.