1 Peter 1:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chineke akwadobela onyinye ndụ ebighị ebi ọ ga-enye ụmụ ya nile. Onyinye a dị nꞌeluigwe ebe Chineke na-echebe ya. Nꞌebe ahụ ọ gaghị emebi emebi, ọ gakwaghị agbanwe ọdịdị ya ma ọ bụkwanụ ree ure.
Igbo 2006
ka ayi we keta nketa nke anāpughi imebi, nke anādighi-emeru kwa emeru, nke nādighi-atalata kwa, nke edebeworo n'elu-igwe nye unu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe.