1 Peter 1:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọnwụnwa na mkpagbu ndị a na-enyere unu aka ịnwapụta ma okwukwe unu nwere o sikwara ike. A na-anwa okwukwe unu dị ka a ga-asị na ọ bụ ọlaedo e ji ọkụ na-anwapụta. Ọ bụ ezie na ọlaedo bụ ihe pụrụ imebi emebi, ma a ga-eji ọkụ nwaa ya, ịmata nke bụ ezi ọlaedo, na nke na-abụghị ya. Ya mere, ebe ọ bụ na okwukwe unu dị oke ọnụ ahia karịa ọlaedo, a ga-anwakwa unu ịhụ ma ọ ga-eguzosikwa ike. Ọ bụrụ na okwukwe unu eguzo chịm nꞌọnọdụ ọnwụnwa ndị a nile, iguzosi ike unu ga-ewetara unu otuto, ebube na nsọpụrụ nꞌụbọchị ahụ Jisọs ga-alọghachi.
Igbo 2006
ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè.