1 Peter 1:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ Kraịst mgbe ọ bụla, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu hụrụ ya nꞌanya. Nꞌezie, ọ bụladị ugbu a unu nwere obi nke jupụtara nꞌụdị ọṅụ ahụ ọnụ na-apụghị ịkọwa.
Igbo 2006
Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.