1 Peter 2:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka ndụ unu na-ebi nꞌetiti ndị na-amaghị Chineke bụrụ ihe e ji ama atụ. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha ghara inwe ọnụ, ọ bụladị mgbe ha chọrọ ikwutọ unu. Ndụ unu na ọrụ ọma unu ga-eme ka ha ghọta ma tookwa Chineke nꞌụbọchị Kraịst ga-alọghachi.
Igbo 2006
nēbinu obi-unu nke-ọma n'etiti ndi mba ọzọ; ka ha we site n'ọlu ọma nile unu, nke ha nēle anya, nye Chineke otuto n'ubọchi nleta ahu nime ihe ahu ha nēkwutọ unu nime ya dika ndi nēme ihe ọjọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Bienụ ezi ndụ nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ na a sị na ha ebo unu ebubo ime ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ọrụ ọma unu, ma nye Chineke otuto nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa.