1 Peter 2:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Sọpụrụnụ ndị na-ejere ndị isi ọchịchị ozi nꞌihi na ha bụ ndị e zitere ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ na itokwa ndị na-eme ezi ihe.
Igbo 2006
ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n'aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto.