1 Peter 2:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
O kwutọghị onye ọ bụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọ bụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama nanị ihe o mere bụ iwere ihe nile nyefee nꞌaka Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi.
Igbo 2006
Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n'aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi.