1 Peter 2:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Bịakwutenụ Chineke dị ka nkume dị nsọ, ka e were unu wuo ụlọ ukwu ahụ dị nsọ. Ebe unu ga-eje ozi dị ka ndị nchụaja dị nsọ. Nꞌihi na unu bụ ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja dị nsọ, nke na-atọ Chineke ụtọ site na Jisọs Kraịst.
Igbo 2006
ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst.