1 Peter 2:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌebe ọzọ nꞌime akwụkwọ nsọ e kwuru sị, “Nke a bụ nkume ahụ ga-eme ka ụfọdụ ndị mmadụ maa nꞌọnya, ọ bụkwa nkume ga-eme ka ha daa.” Ha ga-abụ ndị ọnya mara nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌokwu ahụ. Nꞌihi ya ahụhụ dịịrị ha, dị ka uche Chineke si dị, bụ na ha ga-ada.
Igbo 2006
na, Nkume isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà; n'ihi na ha nāsu ngọngọ n'okwu ahu, ebe ha nēkweyeghi ekweye: edo-kwa-ra ha ka ha me ihe a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ kwa, “Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa.” Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha.