1 Peter 3:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Meenụ obi unu ka ọ dị ọcha, ka ndị na-akọ unu ọnụ na ndị na-ekwulu unu bụrụ ndị ihere ga-eme mgbe ha hụrụ na ihe ha na-ebo unu ebubo banyere ya bụ ihe ọma.
Igbo 2006
ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu.