1 Peter 3:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a bụ ihe ịma atụ na-ezi anyị ihe baptizim pụtara. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-egosi na a zọpụtala anyị site nꞌọnwụ na mbibi nꞌihi mbilite nꞌọnwụ Kraịst. O gosighị na e meela ka anụ ahụ anyị dịrị ọcha nꞌihi baptizim e mere anyị, kama ọ na-egosi na anyị, ndị e mere baptizim na-alọghachikwute Chineke na-arịọ ya ka ọ sachaa mmehie dị nꞌobi anyị.
Igbo 2006
bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst,