1 Peter 3:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke.
Igbo 2006
kama ka ọ buru madu zoro ezo nke nkpuru-obi, n'uwe anāpughi imebi nke bu mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n'anya Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.