1 Peter 3:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Unu bụ di na-alụ nwụnye lezienụ nwụnye unu anya nke ọma. Cheenụ echiche banyere ihe na-akpa ha mkpa nꞌihi adịghị ike ha. Nye ha ugwu ruuru ha nꞌihi na ọ bụ unu na nwụnye unu ga-abụ otu ịnata ndụ ahụ Chineke ga-enye. Ọ bụrụ na unu emesoghị ha mmeso dị ka o si kwesị Chineke agaghị aza ekpere unu.
Igbo 2006
Ndi bu di, otú ahu, sonu nwunye-unu bikọ n'uzọ ihe-omuma, nēkeye ihe bu nwanyi nsọpuru, dika onye nādighi ike kari, dika unu na ha bu kwa ndi nēketakọ amara nke bu ndu; ka ewe ghara ib͕ochi ekpere-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.