1 Peter 3:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya.
Igbo 2006
ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.