1 Peter 4:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nꞌanụ ahụ, unu kwesịkwara inwe ụdị obi ahụ o nwere. Unu kwesịrị ijikere ịhụ ahụhụ. Nꞌihi na mgbe anụ ahụ unu na-ahụ ahụhụ ime mmehie anaghị atọkwa ya ụtọ.
Igbo 2006
Ya mere, ebe Kraist huru ahuhu n'anu-aru, unu onwe-unu were kwa otù izù ahu ke dika ekike-agha; n'ihi na onye huworo ahuhu n'anu-aru agharawo nmehie;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie.