1 Peter 4:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na Chineke nyere gị onyinye izisa ozi ọma na-ezisa ya dị ka a ga-asị na Chineke si nꞌọnụ gị na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-enyere ndị ọzọ aka, were ike ahụ nile Chineke nyere gị mee ya. Ka e site nꞌime ihe nile nye Chineke otuto site nꞌaha Jisọs Kraịst Onyenwe ike na otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.
Igbo 2006
ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.