1 Peter 4:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌoge gara aga unu tụfuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị na-amaghị Chineke ụtọ. Ndụ unu jupụtara nꞌagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ife arụsị, nke na-eduba na mmehie ọjọọ dị iche iche.
Igbo 2006
N'ihi na oge nke gasiworo ezuwo iluputa ihe ndi mba ọzọ nēzube, na ijeghari nime agu ikwa-iko, agu ihe ọjọ nile, manya-ob͕ub͕u nile, ite-egwú nile, iṅubiga-manya-ókè nile, na ikpere-arusi nile jọb͕uru onwe-ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ.