1 Peter 4:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ndị enyi unu na-amaghị Chineke anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ. Nke a pụkwara ime ka ha were unu na-eme ihe ọchị ma ọ bụ ilelị unu anya.
Igbo 2006
nke ha nēchè na ọ bu ihe madu nāhughi mb͕e ọ bula na unu adighi-eso ha n'omume ahu b͕abà n'otù njubiga-ókè ahu nke ndu ila-n'iyì, ha nēkwulu unu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu.