1 Peter 4:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa ozi ọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ, ndị ahụ e kpere ikpe nꞌanụ ahụ mgbe Chineke ji mmiri bibie ụwa. E kwusaara ha ozi ọma a ime ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee ka ha dịrị ndụ nꞌime mmụọ ha dị ka Chineke si na-adịkwa ndụ.
Igbo 2006
N'ihi na ihe eji zìsara ọbuná ndi nwuru anwu ozi ọma bu nka, ka ewe kpe ha ikpé dika esi ekpe madu n'anu-aru, ma ka ha we di ndu dika Chineke si di na mọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa oziọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị e kperela ikpe mgbe ha dị ndụ, dịka e si ekpe mmadụ niile ikpe, ka ha site na nke a bie ndụ dị ka Chineke si chọọ site na mmụọ ahụ.