1 Peter 5:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mụ onwe m, onye bụkwa okenye chọọchị, na-agwa ndị okenye chọọchị nile nọ nꞌetiti unu okwu a. Eji m anya m abụọ hụ Kraịst mgbe ọ nwụrụ nꞌelu obe. Aga m esokwa keta oke nꞌebube ya na otuto ga-abụ nke ya mgbe ọ lọghachiri.
Igbo 2006
Ya mere, ariọm ndi-okenye nọ n'etiti unu, onye mu onwem bu okenye-ibe-unu, ya na onye-àmà nke ahuhu nile nke Kraist, abukwam onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a,