1 Peter 5:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike.
Igbo 2006
Ma Chineke nke amara nile, Onye kpọbatara unu n'ebube ebighi-ebi Ya nime Kraist, mb͕e unu huworo ahuhu nwa oge, Ya onwe-ya gēme ka unu zue okè, me kwa ka unu guzosie ike, me kwa ka unu di ike, tọ kwa unu ntọ-ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.