1 Peter 5:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ site nꞌinyeaka Saịlas ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole a dị nꞌime akwụkwọ a. Dị ka unu maara nke ọma, Saịlas bụ nwanna anyị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ olileanya m na a ga-eji ihe m dere nꞌebe a gbaa unu ume, nꞌihi na edeere m unu ihe bụ eziokwu gbasara otu Chineke si agọzi ndị ya. Ihe nile m dere nꞌebe a bụ ihe ga-enyere unu aka iguzosi ike nꞌịhụnanya ya.
Igbo 2006
Site n'aka Silvanọs, nwa-nna-ayi kwesiri ntukwasi-obi, dika m'nāgu ya, ka m'nēdegara unu akwukwọ n'okwu ole-na-ole, nāriọ unu, nāb͕a kwa àmà na nka bu amara Chineke n'ezie: nēguzosinu ike nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya.