1 Samuel 11:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom Jebesh Gilead, ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’ ” Mgbe ndị ozi a gara zie ndị ikom Jebesh Gilead ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu.