1 Samuel 12:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Samuel we si ndi Israel, Ọ bu Jehova Nke mere Moses na Eron ndi-ndú, Nke me-kwa-ra nna-unu-hà ka ha si n'ala Ijipt rigota.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Samuel gakwara nʼihu nʼokwu ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị họpụtara Mosis na Erọn. Ọ bụkwa ya mere ka nna nna unu ha si nʼIjipt pụta.