1 Samuel 13:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha.