1 Samuel 13:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, n'ubọchi agha, na ahutaghi mma-agha ma-ọbu ube n'aka onye ọ bula n'etiti ndi soro Sọl na ndi soro Jonatan: ma ahutara n'aka Sọl na n'aka Jonatan nwa-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke mere na ahụtaghị mma agha maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha Izrel nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na Jonatan.