1 Samuel 13:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Israel nile we nu, si, na Sọl tib͕uru ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, na Israel aghọwo-kwa-ra ndi Filistia ihe nēsì ísì ọjọ. Ewe kpọkọta ndi Israel iso Sọl rue Gilgal.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ụmụ Izrel niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha Filistia agha, nʼihi nke a, ndị Izrel niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị Filistia.” Ya mere, ndị agha Izrel niile pụtakwara soro Sọl gaa Gilgal.