1 Samuel 17:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ewe chikọta ha na Soko, nke Juda nwe, ha we ma ulo-ikwū-ha n'etiti Soko na Azeka, n'Efes-damim.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka.