1 Samuel 17:28 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Elaiab, bú nwa-nne-ya nke-okenye, we nu mb͕e ọ nāgwa ndikom ahu okwu; iwe Elaiab we di ọku megide Devid, ọ si, N'ìhi gini kwa ka i ridataworo? ọ̀ bu kwa n'aka onye ka i rapuru aturu ole-na-ole ahu n'ọzara? mu onwem mara nganga-gi, na ihe ọjọ nke obi-gi; n'ihi na ọ bu ihu agha ka i ridataworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.”