1 Samuel 17:51 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Devid we b͕a ọsọ, guzo n'elu onye Filistia ahu, were mma-agha-ya, miputa ya n'ọbọ-ya, me ka ọ nwua, ọ were ya bipu isi-ya. Ndi Filistia we hu na dike-ha anwuwo, ha we b͕alaga.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ.